DANIEL 6:6-9
DANIEL 6:6-9 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum. Ub͕u a, eze, me ka isọ-nsọ a guzosie ike, kaye aha-gi n'ihe a edere n'akwukwọ, ka ewe ghara ib͕anwe ya, dika iwu nke Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga. N'ihi nka ka eze, bú Daraiọs, kayere aha-ya n'ihe ahu edere n'akwukwọ, na n'isọ-nsọ ahu.
DANIEL 6:6-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile! Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm. Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.” Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.