DANIEL 6:10-15
DANIEL 6:10-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ. Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ. Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?” Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.” Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.” Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a. Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”
DANIEL 6:10-15 Bible Nso (IGBOB)
Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga. Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta, chọputa Daniel ka ọ nāriọ aririọ, nāriọ kwa aririọ-amara n'iru Chineke-ya. Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga. Mb͕e ahu ha zara, si n'iru eze, Daniel, onye bu otù nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ọ nughi olu-gi, eze, ma-ọbu isọ-nsọ ahu nke i kayeworo aha-gi, kama ub͕ò atọ n'ubọchi ka ọ nāriọ aririọ-ya. Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya. Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe.