Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 5:17-23

DANIEL 5:17-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara. “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma. Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala. Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze. A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa. “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile. Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.

DANIEL 5:17-23 Bible Nso (IGBOB)

Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya. Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma: ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala. Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ: esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo. Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile; ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh