DANIEL 5:13-22
DANIEL 5:13-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda? Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe. Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ. Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.” Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara. “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma. Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala. Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze. A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa. “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile.
DANIEL 5:13-22 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n'iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda? Ọzọ, anuwom ihe bayere gi, si na mọ nke chi nile di nime gi, na ahuwo kwa ìhè na uche na amam-ihe nke kachasi nime gi. Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n'irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m'mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a. Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi. Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya. Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma: ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala. Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ: esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo. Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile