Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 5:1-31

DANIEL 5:1-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Eze Belshaza, kpọrọ puku ndịisi nọ nʼalaeze ya oriri, ebe ha nọ ṅụọ nnọọ mmanya dị ukwuu. Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. Ya mere, a chịtara iko ọlaedo ndị e si nʼụlọnsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem chịkọta. Eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya na ndị nwunye ya na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya. Ha ṅụrụ mmanya tookwa chi nke ọlaedo na ọlaọcha na bronz, na igwe na osisi na nkume. Na mberede, ha hụrụ mkpịsịaka mmadụ ka ọ na-ede ihe nʼaja ụlọ nke ụlọeze ahụ ha nọ nʼime ya, na ncherita ihu ebe a dọbara iheọkụ. Eze nʼonwe ya hụrụ aka ahụ mgbe ọ na-ede ihe ahụ. Mgbe ahụ, ihu eze ahụ tụhịkọtara, gbarụọ nʼihi egwu. Oke ụjọ tụrụ ya. Ụkwụ ya makwara jijiji. Ikpere ya abụọ kụkọtara onwe ha. Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.” Mgbe ahụ, ndị amamihe eze batara, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha pụrụ ịgụta, maọbụ ịkọwara eze ihe ọ pụtara. Nke a mere, ka eze Belshaza maa jijiji karịa, ihu ya gburu maramara ma gbarụkwaa. Ọ gbakwara ndị ozi ya gharịị. Mgbe eze nwanyị, nụrụ olu eze na olu ndị a mara aha ha nʼala ya, ọ batara nʼụlọ oriri ahụ. Eze nwanyị sịrị, “Eze, dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi; ka ihe a mere ghara iwetara gị ihu mgbarụ, atụla ụjọ. Nʼihi na o nwere otu nwoke nọ nʼalaeze gị, onye mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ bi nʼime ya. Nʼoge ahụ nna gị bụ eze, a chọpụtara na nwoke a jupụtara nʼamamihe na nghọta, dịka a ga-asị na ya onwe ya bụ chi. Nna gị eze Nebukadneza mere ya onyeisi ndị amamihe niile, ndị dibịa, ndị na-enyocha kpakpando, ndị Kaldịa na ndị mgba afa niile. Ebe ọ bụ na ezigbo mmụọ, mmụta na nghọta nke e ji akọwa nrọ na ihe mgbagwoju anya, na igbo mkpa dị iche iche, dị nʼime nwoke a a na-akpọ Daniel, nke eze kpọrọ Belteshaza. Ugbu a, zie ozi ka a kpọọ Daniel ka ọ kọwara gị ihe a.” Ya mere, a kpọbatara Daniel nʼihu eze, eze sịrị Daniel, “Ọ bụ gị bụ Daniel, otu nʼime ndị Juda, ndị nna m dọtara nʼagha site na Juda? Anụla m na i nwere mmụọ nke chi niile nʼime gị, na ị bụkwa onye jupụtara na nghọta na amamihe. Ndị amamihe m, na ndị na-enyocha kpakpando abịala nʼihu m ịgụ ihe ahụ e dere nʼaja ụlọ ma ha enweghị ike ịgụta ya maọbụ ịkọwa ihe ọ bụ. Agwara m na i nwere ike ịkọwa ihe ọbụla gbagwojuru anya. Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe e dere nʼaja ma kọwakwara m ihe ọ pụtara, aga m eyikwasị gị uwe odo odo ndị eze, yinyekwa gị ihe olu ọlaedo nʼolu, meekwa ka i bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze m.” Daniel zara nʼihu eze, “Debere onwe gị onyinye gị, ma ọ bụkwanụ were ya nye onye ọzọ. Ma aga m agụrụ gị eze ihe ahụ e dere ma kọwakwara gị ihe ọ pụtara. “Gị eze, Chineke nke kachasị ihe niile elu nyere nna gị, Nebukadneza ike ọchịchị a, na ịdị ukwu, na ebube, na ịma mma. Nʼihi ọkwa dị ukwuu nke o nyere ya, ndị niile, na mba niile di iche iche, na-asụ asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa na-ama jijiji na-atụkwa ya egwu. Ndị eze chọrọ igbu ka o gburu, ọ hapụkwara onye ọbụla ọ chọrọ ịhapụ; o buliri onye ọbụla ọ chọrọ ibuli elu, ma ndị ọ chọrọ iweda nʼala, ka ya onwe ya wedakwara nʼala. Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze. A chụpụrụ ya site nʼetiti ụmụ mmadụ, nyekwa ya echiche uche dịka nke anụmanụ. Ọ bụkwa nʼetiti ụmụ ịnyịnya ibu ọhịa ka ebe obibi ya dị, o soro ha taa ahịhịa dịka oke ehi. Igirigi nke eluigwe deekwara ahụ ya, tutu ruo mgbe ọ matara na Chineke Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ na-eguzobe ka ọ chịa. “Ma gị nwa ya, O Belshaza, ewedaghị onwe gị ala, nʼagbanyeghị na i ma ihe ndị a niile. Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ. Ọ bụ nke a mere o ji zite aka ahụ ị hụrụ, nke depụtara ozi a. “Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin “Ihe okwu ndị a pụtara bụ nke a: “Mene, Chineke agụkọọla ụbọchị ọchịchị gị, mee ka ha bịa na njedebe. “Tekel, atụọla gị nʼime ihe ọtụtụ chọpụta na o nweghị ihe ọbụla ị bụ. “Parsin, ekewala alaeze gị nyefee ya nʼaka ndị Midia na Peshịa.” Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ. Nʼabalị ụbọchị ahụ kwa ka e gburu Belshaza eze ndị Kaldịa. Nʼabalị ahụ kwa ka Daraiọs onye Midia, bidoro ịchị dịka eze. Ọ gbara iri afọ isii na abụọ nʼoge o bidoro ịchị.

DANIEL 5:1-31 Bible Nso (IGBOB)

Belshaza, bú eze, mere oké oriri nye nnù ndi-isi-ya abua na ọgu iri, ọ bu kwa n'iru nnù abua na ọgu iri ahu ka ọ nāṅu manya-vine. Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha. Mb͕e ahu ha chitara iko ọla-edo nke achiputarari n'ulo uku nke ulo Chineke nke di na Jerusalem; eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-iko-ya nwan yi we ṅua manya-vine nime ha. Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume. N'otù oge hour ahu ka nkpisi-aka ufọdu nke aka madu putara, de ihe na ncherita-iru ihe-idọba-oriọna n'elu nzu etere na mb͕idi ulo uku eze: eze nāhu kwa ọbu-aka ahu nēde ihe. Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha. Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi. Mb͕e ahu ndi-amam-ihe nile nke eze batara: ma ha apughi igu ihe ahu edere, ma-ọbu ime ka eze mara isi-ya. Mb͕e ahu eze, bú Belshaza, mara jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke iru-ya b͕anwe-kwa-ra n'aru ya, ọ nāb͕a kwa ndi-isi-ya ghari. Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe: otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze; n'ihi na mọ nke kachasi, na ihe-ọmuma, na uche, na ikọ isi nrọ di iche iche, na ikọ isi okwu-omimi di iche iche, na itọsi okwu nke nāb͕a ghari, ka ahuru nime ya, bú Daniel, onye eze ahu guru aha-ya Belteshaza. Ub͕u a, ka akpọta Daniel, ọ gākọ kwa isi ihe a edere. Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n'iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda? Ọzọ, anuwom ihe bayere gi, si na mọ nke chi nile di nime gi, na ahuwo kwa ìhè na uche na amam-ihe nke kachasi nime gi. Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n'irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m'mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a. Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi. Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya. Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma: ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala. Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ: esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo. Ma gi onwe-gi, bú nwa-ya, Belshaza, i meghi ka obi-gi di ala, ọ bu ezie na i mara ihe a nile; ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: mb͕e ahu ka esiri n'iru ya zilaga ọbu-aka ahu; ọ bu kwa ihe a nke edere ka akaworori. Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN. Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue. TEKEL; atùwo gi n'ihe-ọtùtù, hu na ihe kọrọ nime gi. PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia. Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu. N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea. Ma Daraiọs, bú onye Midia, natara ala-eze ahu mb͕e ọ b͕ara ihe ra ka ọgu arọ atọ na abua.