DANIEL 4:34-37
DANIEL 4:34-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Mmadụ niile bi nʼụwa bụ ihe efu nʼihu ya. Nʼihi na ọ na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ nʼetiti usuu ndị bi nʼeluigwe, na nʼetiti ndị bi nʼụwa. O nweghị onye pụrụ igbochi ya, maọbụ onye pụrụ ịjụ ya sị ya, “Gịnị mere iji mee ihe ndị a?” Mgbe uche m laghachiri dịka mmadụ, enwetaghachikwara m ugwu na nsọpụrụ na alaeze m. Ndị na-adụ m ọdụ laghachikwara bịakwute m, ha na ndị na-ejere m ozi. E mekwara ka m bụrụkwa eze ọzọ nʼalaeze m. Ugwu na nsọpụrụ m nwere ugbu a karịrị ugwu na nsọpụrụ m nwere nʼoge gara aga. Ugbu a, mụ bụ Nebukadneza na-eto, na-asọpụrụ Eze nke eluigwe, nʼihi na ọrụ ya niile dị mma, ụzọ ya niile kwụ ọtọ. Nʼihi na o nwere ike ijide ndị nganga kwanye ha ọnụ nʼime ntụ.
DANIEL 4:34-37 Bible Nso (IGBOB)
Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile: ọ bu kwa ndi nile bi n'uwa ka anāgu n'ihe-efu: ọ bu kwa dika O si achọ ka Ọ nēme n'usu-ndi-agha nke elu-igwe, na n'etiti ndi bi n'uwa: ọ dighi kwa onye gēti aka-Ya ihe, si Ya, Gini ka I meworo? N'otù mb͕e ahu ka ihe-ọmumam nālaghachikutem; ọzọ, n'ihi ebube nke ala-ezem, ima-nmam na ib͕u-maramaram nālaghachikutem; ọ bu kwa mu ka ndi-ndum-ọdum na ndi-isim nēkpere; ọzọ, n'elu ala-ezem ka emerem ka m'nọzie, ọ bu kwa idi-uku nke kachasi ka atukwasirim. Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.