Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 4:1-9

DANIEL 4:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mụ bụ Nebukadneza, Na e zigara mmadụ niile, mba niile, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche nʼụwa ozi: Ka ọ dịrị unu na mma! E ji m obi ụtọ, na-eme ka unu mata ihe ịrịbama niile na ihe iju anya niile, nke Chineke Onye kachasị ihe niile elu meere m. Lee ka ihe ịrịbama ya, na ihe ịtụnanya ya si dị ukwuu! Alaeze ya bụ nke na-adị site ebighị ebi ruo ebighị ebi; ọchịchị ya na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Mụ onwe m, bụ Nebukadneza nọ nʼafọ ojuju na ihe ịga nke ọma nʼụlọeze m. Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m. Nʼihi ya, enyere m iwu ka a kpọọ ndị amamihe niile m nwere na Babilọn ka ha bịa nʼihu m, bịa kọwaara m isi nrọ ahụ. Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya. Nʼikpeazụ, Daniel batara nʼihu m, onye aha ya bụ Belteshaza dịka aha chi m si dị, onye mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime ya. Akọọrọ m ya ihe ahụ m rọrọ na nrọ. Asịrị m, “Belteshaza, onyeisi ndị nkọwa ihe niile. Amaara m na mmụọ nke chi niile dị nsọ bi nʼime gị. Amakwaara m na o nweghị ihe omimi ọbụla ga-esiri gị ike ịchọpụta ọsịsa ya. Ugbu a, nke a bụ nrọ m, kọwaara m ihe ọ pụtara.