DANIEL 3:17-18
DANIEL 3:17-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị. Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.”
Kesaa
Gụọ DANIEL 3DANIEL 3:17-18 Bible Nso (IGBOB)
Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi. Ma asi na Ọ pughi inaputa ayi, ka i mara, eze, na chi-gi nile ka ayi nāgaghi-adi nēfè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo ahu nke i guzobeworo ọtọ ka ayi nāgaghi-akpọ isi ala nye.
Kesaa
Gụọ DANIEL 3