DANIEL 2:4-13
DANIEL 2:4-13 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa. Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia. Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya. Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa. Eze zara, si, Mu onwem amasiwo na mb͕e a ka unu onwe-unu nāzuchapu, n'ihi na unu ahuwo na o nēguzosi ike site n'ọnum, bú okwu a: na asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n'ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n'irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n'ihi nka zerem nrọ a, m'we mara na unu gākọrọm isi-ya. Ndi Kaldea zara n'iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n'elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n'ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n'aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a. Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n'iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n'etiti anu-aru, bú madu. N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi. Iwu ahu we puta; ewe gaje ib͕u ndi ahu mara ihe; ha we chọ Daniel na ndi-ibe-ya ka ewe b͕ue ha.
DANIEL 2:4-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ndị ahụ na-enyocha kpakpando gwara eze ahụ okwu nʼasụsụ ndị Siria sị, “Ka gị eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Ị ga-agwa ụmụodibo gị nrọ a ị rọrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.” Ma eze zara ndị Kaldịa, “Nke a bụ ihe m kpebirila: Ọ bụrụ na unu agwaghị m ihe nrọ a na nkọwa ya bụ, aga m eme ka abọkasịa unu, tikpọkwa ụlọ unu, mee ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe. Ma ọ bụrụ na unu gwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ ma kọwaakwa ya, aga m enye unu onyinye dị iche iche na ụgwọ ọrụ nsọpụrụ dị ukwuu. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ na nkọwa ya.” Ọzọkwa, ha zaghachiri, “Ka eze gwa ndị ohu ya ihe ọ rọrọ na nrọ, anyị ga-akọwakwa ya.” Eze zaghachiri, “Ama m na ọ bụ oge ka unu na-achọ inweta nʼihi na unu amatala na ihe a ka m kpebiri ime. Ọ bụrụ na unu agwaghị m nrọ ahụ naanị otu ntaramahụhụ dịịrị unu. Unu agbaala izu ịgwa m okwu ụgha na okwu nduhie na-ele anya na ọnọdụ ga-agbanwe. Ya mere, gwanụ m nrọ ahụ, m ga-amatakwa na unu pụrụ ịkọwara m ya.” Ndị Kaldịa zara eze, “Ọ dịghị mmadụ ọbụla nʼelu ụwa a nke nwere ike ime ihe a eze na-achọ. Ọ dịghịkwa eze, nʼagbanyeghị ịdị ukwuu ya na ịdị ike ya, nke jụtụrụla ụdị ihe dị otu a eze na-ajụ nʼaka ndị mgbaasị, ndị na-agba aja ya, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, na ndị Kaldịa. Ihe a ị chọrọ ka anyị mee bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ọ bụ naanị ndị mmụọ nwere ike ịkọrọ gị ihe ị rọrọ na nrọ. Ndị mmụọ anọkwaghị nʼetiti ndị mmadụ.” Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn. Mgbe e kwupụtara iwu onye eze ka e gbuo ndị oke amamihe niile, ndị agha chọkwara ebe Daniel na ndị otu ya nọ ka ha gbuo ha.