Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DANIEL 2:24-30

DANIEL 2:24-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼihi ya, Daniel jekwuru Ariok, onye ahụ eze nyere iwu igbu ndị ndụmọdụ niile dị na Babilọn, sị ya, “Egbukwala onye ọbụla nʼime ndị amamihe Babilọn. Kama duru m gaa nʼihu eze nʼihi na ejikeere m ịgwa ya ihe ahụ ọ chọrọ ịmata.” Mgbe ahụ, Ariok mere ngwangwa duru Daniel gaa nʼihu eze, sị ya, “Achọpụtala m otu onye nʼime ndị Juda a dọtara nʼagha nwere ike ịgwa eze ihe nrọ ya pụtara.” Eze jụrụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), “I nwere ike ịgwa m ihe ahụ m rọrọ na nrọ, na ịkọwara m ihe ọ pụtara?” Daniel gwara eze, “O nweghị onye amamihe ọbụla, onye ọbụla ya na mmụọ na-ekwu okwu, onye mgbaasị ọbụla maọbụ onye na-enyocha kpakpando ọbụla pụrụ ịgwa eze ihe omimi a ị chọrọ. Ma o nwere Chineke nọ nʼeluigwe, onye na-ekpughe ihe omimi niile. O gosila Nebukadneza ihe ga-eme nʼụbọchị ndị dị nʼihu. Nrọ gị na ọhụ niile nke gara nʼuche gị mgbe ị dinara nʼihe ndina gị bụ ndị a: “Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme. Ma mụ onwe m, ekpugheghị ihe omimi a nye m nʼihi na m karịrị mmadụ ọbụla dị ndụ nʼamamihe, kama ọ bụ ka gị bụ eze mata nkọwa ya ma ghọtakwa ihe gabigara nʼuche gị.