DANIEL 10:10-12
DANIEL 10:10-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ. Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji. Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha.
DANIEL 10:10-12 Bible Nso (IGBOB)
Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua. O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji. O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile.