NDI KỌLỌSI 2:13-14
NDI KỌLỌSI 2:13-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile, kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.
NDI KỌLỌSI 2:13-14 Bible Nso (IGBOB)
Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile; mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya