Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI KỌLỌSI 1:15-29

NDI KỌLỌSI 1:15-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu. Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị. Ọ bụ ya bụ mmalite, onye mbụ a mụrụ nʼetiti ndị niile ga-esi nʼọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nʼime ihe niile. Nʼihi na ọ bụ nʼime ya ka ọ masịrị ozuzu oke ya ibi. Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe. Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu. Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha. Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya. Ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ nʼihi ahụhụ ndị a nke m na-ahụ nʼihi unu, ana m emezu ihe fọdụrụ nʼahụhụ ahụ Kraịst tara nʼihi anụ ahụ ya bụ chọọchị. Emeela ka m bụrụ onyeozi chọọchị ya site nʼikike Chineke nyere m, ikwusara unu okwu Chineke nʼozuzu oke ya. Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. Ọ bụ ha ka Chineke họpụtara ime ka amata akụ nke ebube nke ihe omimi a nʼetiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kraịst nʼime unu, onye bụ olileanya nke ebube ahụ. Ọ bụ ya ka anyị na-ekwusa, na-adụ onye ọbụla ọdụ, na-akụzikwara onye ọbụla ihe site nʼamamihe niile. Nʼihi na anyị chọrọ iche mmadụ niile ọbụla nʼihu ya dị ka ndị zuruoke nʼime Kraịst. Nʼihi nke a ka m na-adọgbu onwe m nʼọrụ, dị ka ike ya dị ukwuu nke na-arụ ọrụ si dị m nʼime.

NDI KỌLỌSI 1:15-29 Bible Nso (IGBOB)

Onye bu onyinyo nke Chineke ahu Nke anāpughi ihu anya, buru kwa onye eburu uzọ mu n'ihe nile ekère èkè; n'ihi na nime Ya ka ekère ihe nile, nke di nime elu-igwe na nke di n'elu uwa, ihe apuru ihu anya na ihe anāpughi ihu anya, ma ọ bu oche-eze, ma-ọbu ibu-ndi-nwe-madu, ma-ọbu ibu-ndi-isi, ma-ọbu ichi-isi; esitewo n'aka-Ya kè ihe nile, ekèwo-kwa-ra Ya ihe nile; Ya onwe-ya bū kwa ihe nile uzọ, ọ bu kwa nime Ya ka ihe nile nēguzokọ n'otù. Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n'ihe nile. N'ihi na ọ buri ihe di Nna-Ya ezi nma ka ozuzù nile bigide nìme Ya; ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe. Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù nime aru nke anu-aru-Ya, site n'ọnwu-Ya, iche unu n'iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo: ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu n'ahuhu m'nāhu n'ihi unu, anamemezu kwa n'akuku nkem ihe fọduru na nkpab͕u nile nke Kraist-ayi n'anu-arum n'ihi aru-Ya, nke bu nzukọ-Ya; nke emere mu onwem onye nējere ya ozi, dika ọlu ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke si di nke enyerem n'ebe unu nọ, ikwuzu okwu Chineke, bú ihe-omimi nke ezoworo ezo site n'oge nile site kwa n'ọb͕ọ nile: ma ub͕u a ka emere ya ka ọ puta ìhè nye ndi nsọ Ya, ndi Chineke chọrọ ime ka ha mara ihe bu àkù nke ebube nke ihe-omimi a n'etiti ndi mba ọzọ, nke bu Kraist nime unu, bú olile-anya nke ebube ahu: Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n'amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n'iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist; anamadọb͕u kwa onwem n'ọlu ime ihe a, nāb͕asi nb͕a ike dika i1usi-ọ1u-ike nke Ya si di, nke nālusi ike nimem n'ike.