ỌLU NDI-OZI 9:26-28
ỌLU NDI-OZI 9:26-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha. Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu. O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu.
ỌLU NDI-OZI 9:26-28 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus. Ma Banabas jidere ya n'aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n'uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n'aha Jisus. Ya na ha we nọ, ọ nābata nāpu kwa na Jerusalem