ỌLU NDI-OZI 7:44-50
ỌLU NDI-OZI 7:44-50 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis. Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid. Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi. Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ. “Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru, “ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru. Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
ỌLU NDI-OZI 7:44-50 Bible Nso (IGBOB)
Nna-ayi-hà nwere ulo-ikwū nke àmà n'ọhia, dika Ọ kara àkà, bú Onye gwara Moses, ka o me ya ka ọ di ka ihe-atù nke ọ hururi. Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid; onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi. Ma Solomon wuru Ya ulo. Otú ọ di, Onye kachasi ihe nile elu adighi-ebi n'ulo eji aka wu; dika onye-amuma siri, Elu-igwe bu oche-ezem, Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua: Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru: Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem? Ọ̀ bughi akam mere ihe ndia nile?