ỌLU NDI-OZI 7:1-8
ỌLU NDI-OZI 7:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?” Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran. Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’ “Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a. O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa. Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ. Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’ O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
ỌLU NDI-OZI 7:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a? O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran, O we si ya, Si n'ala-gi na n'etiti ikwu-gi pua, bia n'ala ahu nke M'gēgosi gi. Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a: ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru. Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ. Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a. O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.