ỌLU NDI-OZI 6:8-14
ỌLU NDI-OZI 6:8-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.” Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe. Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị. Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.”
ỌLU NDI-OZI 6:8-14 Bible Nso (IGBOB)
Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju. Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju. Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu. Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke. Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé, we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi: n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka.