ỌLU NDI-OZI 6:3-15
ỌLU NDI-OZI 6:3-15 Bible Nso (IGBOB)
Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà. Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke. Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju: ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi. Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti. Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju. Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju. Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu. Mb͕e ahu ha jiri aghughọ we rọputa ndikom, ndi siri, Ayi anuwo ya ka o nēkwu okwu nēkwulu Moses na Chineke. Ha we kpalie ndi-Ju, na ndi-okenye, na ndi-ode-akwukwọ, we biakwasi ya, jide ya, kubata ya na nnọkọ-ikpé, we guzo ndi-àmà ugha, ndi si, Nwoke a arapughi ikwu okwu megide ebe nsọ a, na iwu-ayi: n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka. Ndi nile ndi nọduru na nnọkọ-ikpé ahu, mb͕e ha legidere ya anya, ha we hu iru-ya dika ọ bu iru mọ-ozi.
ỌLU NDI-OZI 6:3-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka. Ebe anyị onwe anyị, ga-enyefe onwe anyị nʼọrụ ikpe ekpere, na ọrụ niile metụtara izisa oziọma.” Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu. Ha chere mmadụ ndị a nʼihu ndị ozi, ndị kpeere ha ekpere, bikwasịkwa ha aka nʼisi. Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe. Ugbu a, Stivin, nwoke jupụtara nʼamara na nʼike Chineke rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Mgbe ahụ ụfọdụ ndị Juu si nʼụlọ nzukọ nke ndị nweere onwe ha (dị ka e si akpọ ya), na nke ndị Sirini na Alegzandria nakwa ndị ọzọ sitere na mpaghara Silisia na Eshịa. Ha na Stivin malitere ịrụgharị ụka. Ma ha enweghị ike iguzogide amamihe na ike nke Mmụọ Nsọ nke o ji ekwu okwu. Mgbe ahụ, ha ji ụzọ nzuzo kpalie ụfọdụ ndị ikom ka ha sị, “Anyị nụrụ ka ọ na-ekwujọ Mosis na Chineke.” Ha kpasuru ndị mmadụ, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere ya jide ya, kpụrụ ya gaa na nnọkọ ụlọ ikpe. Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide ya sị, “Oge niile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ebe a dị nsọ na iwu anyị. Anyị nụrụ ka o kwuru, na Jisọs onye Nazaret a ga-akwatu ụlọ a, gbanwekwa omenaala Mosis nyere anyị.” Ndị niile nọ nʼụlọikpe ahụ legidere ya anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwu dị ka ihu mmụọ ozi.