ỌLU NDI-OZI 5:25-33
ỌLU NDI-OZI 5:25-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.” Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume. Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ, sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.” Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ. Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi. Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie. Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.” Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha.
ỌLU NDI-OZI 5:25-33 Bible Nso (IGBOB)
Ma otù onye biara kọrọ ha, si, Le, ndikom ahu unu tubàra n'ulo-nkpọrọ nọ n'ulo uku Chineke nēguzo nēzí kwa ndi-Ju ihe. Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume. Ma mb͕e ha kutasiri ha, ha guzoro ha n'etiti nnọkọ-ikpé. si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi. Ma Pita na ndi-ozi zara, si, Ayi aghaghi ikweyere Chineke kari madu. Chineke nke nna-ayi-hà mere ka Jisus si n'ọnwu bilie, Onye unu onwe-unu b͕uru, nākwuba Ya n'elu osisi. Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe ndia; Mọ Nsọ bu kwa onye-àmà, Onye Chineke nyere ndi nēkweyere Ya. Ma mb͕e ha nuru nka, amapue ha n'obi-ha, ha we zube ib͕u ha.