ỌLU NDI-OZI 4:32-37
ỌLU NDI-OZI 4:32-37 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọra ndi kwere na Kraist nwere otù obi na otù nkpuru-obi: ọ dighi kwa otù onye n'etiti ha nāsi na ihe ọ bula nime ihe nile o nwere bu nke aka ya; kama ha nwekọrọ ihe nile. Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n'ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile. N'ihi na ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti ha nkpà nākpà: n'ihi na ka ha ra, bú ndi nwere ala ma-ọbu ulo, ha nēre ha, weta ọnu-ahia nile nke ihe nile erere, tọb͕ọ ha n'ukwu ndi-ozi: ewe nēkè òkè enye ha nile n'otù n'otù, dika ọ di onye ọ bula nkpà. Ma Josef, onye ndi-ozi kpọ-kwa-ra Banabas, (nke bu, ma asugharia ya, Nwa nke nkasi-obi), bú onye Livai, onye Saiprọs n'ọmumu-ya, ebe o nwere ubi, o re ya, weta ego-ya, tọb͕ọ n'ukwu ndi-ozi.
ỌLU NDI-OZI 4:32-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị niile kwere ekwe nwere otu obi nʼotu mkpụrụobi. O nweghị onye ọbụla gụrụ ihe ọbụla o nwere dịka nke aka ya, kama ha mere ka onye ọbụla nʼime ha keta oke nʼihe ibe ya nwere. Ndị ozi sitere nʼike gaa nʼihu na-agba ama banyere mbilite nʼọnwụ Onyenwe anyị Jisọs, oke amara bakwaara ha niile ụba. O nweghị onye mkpa kpara nʼime ha, nʼihi na site nʼoge ruo nʼoge, ndị nwere ala maọbụ ụlọ na-ere ha, ma wetakwa ego ha retara na ha, nye ndị ozi, a na-ekekwa ya nye onye ọbụla dị ka mkpa ya si dị. Josef onye ikwu Livayị, onye sitere na Saiprọs, onye ndị ozi na-akpọ Banabas (nke pụtara “nwa nke nkasiobi”). O rere ala o nwere, weta ego ya, ma tọgbọ ya nʼụkwụ ndị ozi.