ỌLU NDI-OZI 4:18-21
ỌLU NDI-OZI 4:18-21 Bible Nso (IGBOB)
Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus. Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke: n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa. Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.
ỌLU NDI-OZI 4:18-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha kpọrọ ha nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ izi ihe nʼaha Jisọs. Ma Pita na Jọn zara sị ha, “Kpeenụ ikpe a nʼonwe unu, maọbụ ihe ziri ezi nʼanya Chineke ige unu ntị karịa ige Chineke ntị? Nʼihi na ọ bụ ihe rara ahụ na anyị ga-akwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ.” Mgbe ha batụchara ha mba, ha hapụrụ ha ka ha laa. O nweghị ụzọ ọbụla ha ga-esi taa ha ahụhụ nʼihi na mmadụ niile nọ na-eto Chineke nʼihi ihe a mere.