ỌLU NDI-OZI 27:39-44
ỌLU NDI-OZI 27:39-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee. Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala. Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ. Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo. Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala. Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.
ỌLU NDI-OZI 27:39-44 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e chi bọrọ, ha amataghi ala ahu: ma ha huru otù ọnu-miri nke nwere ótú, ha we b͕a ìzù ma ha puru ime ka miri nubà ub͕ọ n'ala. Mb͕e ha tupusiri arilika nile, rapu kwa ha n'oké osimiri, ha we tọpu udọ̀ umara isi-ub͕ọ n'otù oge ahu; ha we dọlie ákwà-ifufe nke ọnu-ub͕ọ nye ifufe, we jebe n'ótú. Ma ebe ha dabàra n'otù ebe di n'ab͕ata oké osimiri abua, ha we tiye ub͕ọ n'ala; ọnu-ub͕ọ we siri n'ala digide kwa nēnweghi ike ka eropu ya, ma ike ebili-miri nyajibere isi-ub͕ọ. Ma ọdú ndi-agha duru bu ka ha b͕ue ndi-nkpọrọ, ka onye ọ bula nime ha ghara isi n'ub͕ọ gwu miri, we b͕alaga. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, ebe o nēzube izọputa Pọl, o b͕ochiri ha n'ìzù-ha; we si ka ndi puru igwu miri si n'ub͕ọ tubà onwe-ha na miri, buru uzọ rue ala: ka ndi fọduru ru kwa, ufọdu n'elu ibo, ndi ọzọ n'elu ihe di iche iche si n'ub͕ọ puta. Otú a o we rue, na azọputara madu nile, ha we rue ala.