Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 27:1-12

ỌLU NDI-OZI 27:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs. Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a. Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma. Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs. Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia. Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya. Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee. Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia. Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ, na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.” Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru. Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.

ỌLU NDI-OZI 27:1-12 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs. Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi. Ubọchi soni ayi we rue ala na Saidon: Juliọs we were obi-ọma mezie Pọl, kwere ka o jekuru ndi-eyì-ya ka ewe le ya anya nke-ọma. Ayi we si n'ebe ahu nupu ub͕ọ, we nāga ala Saiprọs nso, n'ihi na ifufe nēfegide ayi. Mb͕e ayi gabigasiri oké osimiri nke di n'akuku Silisia na Pamfilia, ayi we rue Maira, obodo nke Lisia. N'ebe ahu ka ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise huru ub͕ọ Aleksandria nke nēje Itali; o we me ka ayi ba nime ya. Mb͕e ayi gasiri nwayọ ọtutu ubọchi, mb͕e ọ di kwa ayi ike iru na ncherita-iru Naidọs, ebe ifufe nēkweghi ka ayi ga n'iru ọzọ, ayi we nāga ala Krit nso, na ncherita-iru Salmoni; o we di ayi ike iga n'akuku ya, ayi we rue otù ebe anākpọ Ọnu-miri Ọma; nke obodo Lasia di ya nso. Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti, si ha, Ndikom, ahuwom na nbibi na oké iyì gaje idi n'ije-ub͕ọ a, ọ bughi nání nke ihe ub͕ọ nēbu na ub͕ọ onwe-ya, ma nke ndu-ayi kwa. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise kweyere onye-isi ub͕ọ na onye nwe ub͕ọ, kari okwu Pọl kwuru. Ebe ọnu-miri ahu nādighi n'ebe di nma inogide na mb͕e oyi, ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha we du ọdú ka enupu ub͕ọ n'ebe ahu, ma eleghi anya ha gēru Finiks, we nọgide n'ebe ahu na mb͕e oyi; nke bu otù ọnu-miri nke Krit, nke nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu n'akuku Ugwu na akuku Ndida.