ỌLU NDI-OZI 25:1-12
ỌLU NDI-OZI 25:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl. Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ. Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.” Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl. Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa. Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.” Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?” Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma. Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.” Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”
ỌLU NDI-OZI 25:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere Festọs, mb͕e ala ahu batasiri n'aka-ya, mb͕e ubọchi atọ gasiri o si na Sisaria rigoro Jerusalem. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi n'etiti ndi-Ju we kọrọ ya akukọ megide Pọl; ha riọkwa-ra ya, nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ. Otú ọ di, Festọs zara, si na anēdebe Pọl na Sisaria, si kwa na ya onwe-ya gaje ilaghachi ọsọsọ. Ọ si, Ya mere, ka ndi ji ike n'etiti unu som rida, ọ buru kwa na ọ di ihe ọ bula nwoke ahu mehiere, ka ha bo ya ebubo. Mb͕e ọ nọsiri n'etiti ha ihe nākaghi ubọchi asatọ ma-ọbu ubọchi iri, ọ ridata na Sisaria; echi-ya o we nọdu n'oche-ikpé-ya, we si ka ekuta Pọl. Mb͕e ọ biaruru, ndi-Ju ndi siworo na Jerusalem ridata we guzo ya buruburu, nēbo ya ọtutu ebubo di arọ́, nke ha nēnweghi ike igosi; Pọl nāgọpu kwa onwe-ya, si, Emehieghm ma-ọli megide iwu ndi-Ju, ma-ọbu imegide ulo uku Chineke, ma-ọbu imegide Sisa. Ma Festọs, ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, ọ zara Pọl, si, Ì n'achọ irigoro Jerusalem, ka akpe gi ikpé banyere ihe ndia n'irum n'ebe ahu? Ma Pọl siri, Anameguzo n'iru oche-ikpé nke Sisa, ebe aghaghi ikpem: emegideghm ndi-Ju ajọ omume ọ bula, dika gi onwe-gi mazu-kwa-ra nke-ọma. Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku. Mb͕e ahu Festọs, mb͕e ya na nnọkọ-ikpé-ya b͕asiri ìzù, ọ zara, si, I kpọkuwo Sisa: ọ bu Sisa ka i gāgakuru.