Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 23:12-35

ỌLU NDI-OZI 23:12-35 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e chi-ya bọrọ, ndi-Ju ufọdu we kekọta onwe-ha n'otù, me kwa onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori Pọl. Ndi ṅukọrọ iyi a kariri ọgu ndikom abua. Ndi ahu we biakute ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Ayi ji anathema me onwe-ayi ka ayi buru anathema, na ayi agaghi-edetu ihe ọ bula ọnu rue mb͕e ayi gēb͕uwori Pọl. Ya mere ub͕u a unu onwe-unu na nnọkọ-ikpé-ayi gosi onye-isi-ọchi-agha ka o kuda ya biakute unu, dika unu gaje itule ihe bayere ya nke-ọma kari: ma ayi onwe-ayi bu ndi edoziworo ib͕u ya mb͕e ọ kābiarughi unu nso. Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl. Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya. Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m'dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi. Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n'aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm? Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari. Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha. Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia. O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali: ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi. O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka: Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya. Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n'aka-ha, ebe m'nutasiri na ọ bu onye Rom. Ebe m'zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m'we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha: onye m'huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u. Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi. Ya mere ndi-agha, dika akara ha àkà, were Pọl, kuru ya rue Antipatris n'abali. Ma n'echi-ya ha rapuru ndi-inyinya ka ha so ya je, ha we laghachi n'ulo ndi-agha: mb͕e ndi ahu biaruru Sisaria, nye kwa onye-isi akwukwọ-ozi ahu, ha we che kwa Pọl n'iru ya. Mb͕e ọ gusiri ya, ọ jua ajuju ala o si puta; mb͕e ọ jutara na ọ bu onye Silisia, ọ si, M'gānuzu okwu-gi mb͕e ọ bula ndi boro gi ebubo gēru kwa ebe a: o we nye iwu ka edebe ya na Pritoriọm nke Herod.

ỌLU NDI-OZI 23:12-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụtụtụ echi ya ụfọdụ ndị Juu zukọtara gbaa izu, ṅụọkwa iyi na ha agaghị eri nri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu Pọl. Ndị zukọtara gbaa izu ọjọọ a karịrị iri mmadụ anọ. Ha jekwuuru ndịisi nchụaja ha na ndị okenye, sị ha, “Anyị kwekọtara ịhapụ iri maọbụ ịṅụ ihe ọbụla tutu ruo mgbe anyị gburu Pọl. Ugbu a, unu na nzukọ zienụ onyeisi ọchịagha ka ọ kpọpụtara unu ya. Meenụ ka unu na-achọ ịjụpụtasị eziokwu nʼọnụ ya nakwa itule ikpe ya nke ọma. Anyị dị njikere igbu ya nʼụzọ tupu ọ bịaruo unu nso.” Ma nwa nwanne nwanyị Pọl nụrụ maka izuzu ọjọọ a. Ọ banyere nʼogige ndị agha kọọrọ Pọl. Pọl kpọrọ otu nʼime ndịisi agha ahụ gwa ya, “Biko kpọrọ nwokorobịa a gaa nʼebe ọchịagha nọ, o nwere okwu dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ya.” Ọ kpọọrọ ya jekwuru onyeisi agha, sị. “Pọl, onye mkpọrọ, kpọrọ m rịọ m ka m kpọtara gị nwokorobịa a nʼihi na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa gị.” Onyeisi agha ahụ duuru ya nʼaka ya gaa nʼakụkụ ọzọ jụọ ya, “Gịnị bụ ihe ị chọrọ ịkọrọ m?” Ọ sịrị, “Ndị Juu ụfọdụ ekwekọrịtala ịrịọ gị ka ị kpọpụta Pọl echi na nzukọ ụlọ ikpe. Ha ga-eme dịka ha nwere ihe dị mkpa ha chọrọ ịjụta ya. Ma aṅala ha ntị. Nʼihi na ihe karịrị iri mmadụ anọ na-ezo onwe ha na-eche inwude ya. Ndị a gbara ndụ na ha agaghị eri maọbụ ṅụọ ihe ọbụla tutu ruo mgbe ha gburu ya. Ha adịla njikere, ihe a na-eche bụ mkpebi gị nye arịrịọ ha.” Ọchịagha ahụ zilagara nwokorobịa ahụ site nʼinye ya iwu, “Emekwala ka onye ọbụla mata na ị bịara gwa m ihe dị otu a.” Mgbe e mesịrị, ọ kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndịisi agha nye ha iwu sị, “Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ, na iri mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya, tinyere narị ndị ikom abụọ ndị na-ama ùbe, ndị ga-aga Sizaria nʼelekere itoolu nke abalị a. Nyekwa Pọl ịnyịnya nke ọ ga-agba, ka e nwee ike duru ya gakwuru Feliks bụ gọvanọ nʼudo.” O dere akwụkwọ nʼolu dị otu a: Klọdiọs Lisias, Na-edegara Feliks onye nsọpụrụ na-adịrị, onye na-achị akụkụ a. Ana m ekele gị. Ndị Juu jidere nwoke a chọọ igbu ya, ma mgbe m nụrụ na ọ bụ onye Rom, mụ na ndị agha m bịara napụta ya nʼaka ha. Achọrọ m ịmata ihe mere ha ji ebo ya ebubo, nʼihi ya eduuru m ya gaa nʼọgbakọ ndị okenye ha. Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere iwu ha. Nʼeziokwu, o nweghị ihe ọbụla kwesiri iji tụọ ya mkpọrọ maọbụ ọnwụ nʼime ebubo ahụ. Mgbe a gwara m banyere izuzu a na-agba megide nwoke a, ezitere m gị ya nʼegbughị oge. Enyekwara m ndị niile na-ebo ya ebubo iwu, ka ha bịa nʼihu gị kpee ọnụ ha. Ya mere, nʼabalị ahụ, ndị agha dubatara Pọl na Antipatris dịka e nyere ha nʼiwu. Nʼechi ya, ha hapụrụ ya na ndị na-agba nʼelu ịnyịnya ka ha duru ya gawa, ebe ha laghachiri nʼogige ndị agha. Mgbe ha bịarutere Sizaria, ha nyere onyeisi obodo ahụ akwụkwọ ozi, ma kpọnyekwa ya Pọl. Gọvanọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ, jụọ ya akụkụ ala o si pụta. Mgbe ọ matara na ọ bụ onye Silisia, ọ sịrị ya, “Aga m enye okwu gị ezigbo ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” O nyekwara iwu ka e debe ya nʼobi Herọd nʼaka ndị nche.