Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 23:1-10

ỌLU NDI-OZI 23:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe Pọl legidere ndị nzukọ a anya, ọ sịrị, “Ụmụnna m, mụ onwe m ejirila ezi akọnuche bie ndụ m niile nʼihu Chineke ruokwa ụbọchị taa.” Nke a mere, Ananayas onyeisi nchụaja nyere iwu ka ndị nọ ya nso tie ya aka nʼọnụ. Ma Pọl, sịrị ya, “Otu a ka Chineke ga-esi tie gị, gị mgbidi e tere nzu. Ụdị onye ikpe dị aṅaa ka ị bụ i ji na-emebi iwu nʼonwe gị site nʼinye iwu ka e si otu a tie m ihe?” Ndị guzo ya nso sịrị, “Ị na-ekwutọ onyeisi nchụaja Chineke?” Ma Pọl sịrị, “Aghọtaghị m, ụmụnna m na ọ bụ onyeisi nchụaja. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ekwula okwu ọjọọ ọbụla megide onye na-achị ndị nke gị.’” Mgbe Pọl chọpụtara na otu ụzọ nʼime nzukọ ahụ bụ ndị otu Sadusii, ebe ndị ọzọ bụkwa ndị Farisii, o tiri mkpu nʼime nnọkọ ahụ sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii na nwa ndị Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nʼihi olileanya m nwere na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” Mgbe o kwusiri nke a esemokwu dapụtara nʼetiti ndị Farisii na ndị Sadusii. Ọgbakọ ahụ kewara. Nʼihi na ndị Sadusii na-asị na mbilite nʼọnwụ maọbụ mmụọ ozi maọbụ mmụọ ọbụla adịghị. Ma ndị Farisii kweere nʼihe ndị a niile. Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nʼotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nʼoke olu sị, “Anyị ahụghị ihe ọjọọ nʼebe nwoke a nọ, ma gịnịkwa ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ, maọbụ mmụọ ozi gwara ya okwu?” Esemokwu a bịara karịa, nke mere na onyeisi ọchịagha tụrụ egwu na ha ga-adọkasị Pọl. Ọ gwara ndị agha ya ka ha banye were ike kpọpụta ya, ziga ya nʼogige ndị agha.

ỌLU NDI-OZI 23:1-10 Bible Nso (IGBOB)

Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta. Onye-isi-nchu-àjà, bú Ananaias, we gwa ndi guzoro ya nso ka ha tie ya aka n'ọnu. Mb͕e ahu Pọl siri ya, Chineke gaje iti gi aka, gi mb͕idi etere nzu: gì onwe-gi nānọdu kwa ala ikpem ikpé dika iwu-ayi si di, i we kwue ka etiem aka n'uzọ megidere iwu ahu? Ndi guzoro nso we si, Ì nēkwutọ onye-isi-nchu-àjà nke Chineke? Pọl we si, Amataghm, umu-nnem, na ọ bu onye-isi-nchu-àjà: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ekwula okwu ọjọ megide onye-isi ọ bula nke ndi nke gi. Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu. Mb͕e o kwusiri okwu a, esem-okwu we puta n'etiti ndi-Farisi na ndi-Sadusi: ọra ndi ahu we kewa. N'ihi na ndi-Sadusi nāsi na nbilite-n'ọnwu, ma-ọbu mọ-ozi, ma-ọbu mọ, adigh: ma ndi-Farisi nēkwuputa ha abua. Oké iti-nkpu we puta: ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ ndi di n'akuku ndi-Farisi we guzo ọtọ, lu kwa ọ̀gù, si, Ayi ahughi ihe ọjọ n'aru nwoke a: ma gini kwa ma ọ buru na mọ ma-ọbu mọ-ozi gwara ya okwu? Mb͕e oké esem-okwu putara, onye-isi-ọchi-agha, ebe ọ nātu egwu na ha gādọkasi Pọl ma eleghi anya, o we gwa ndi-agha ka ha rida napu ya n'ike n'etiti ha, kuta ya n'ulo ndi-agha.