Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 20:13-38

ỌLU NDI-OZI 20:13-38 Bible Nso (IGBOB)

Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala. Mb͕e o zutere ayi n'Asọs, ayi were ya n'ub͕ọ, we bia rue Mitilini. Ayi we si n'ebe ahu ga, we rue na ncherita-iru Kaiọs n'ubọchi soni; ubọchi so ya ayi we rue ala na Samọs, we chere oge ufọdu na Trogilium; ubọchi soni ayi we bia rue Militọs. N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya. O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya. Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha, Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile, otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju: otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù, nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ. Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu: ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem. Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke. Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ. N'ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n'ebe ọbara madu nile di. N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke. Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya. Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere; ndikom gēsite kwa n'etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n'azu. N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie. Ub͕u a ararakwam unu nye n'aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n'etiti ndi nile edoworo nsọ. Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm. Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha. N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe. Mb͕e o kwusiri ihe ndia, o b͕ue ikperè n'ala, ya na ha nile kpere Chineke. Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu, ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n'ije-ya rue mb͕e ọ batara n'ub͕ọ.

ỌLU NDI-OZI 20:13-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ. Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen. Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs. Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime. Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya. Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a. Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m. Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha. E kwusaala m nye ma ndị Juu ma ndị Griik okwu nchegharị nʼebe Chineke nọ, na okwukwe nʼebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ. Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ. Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke. “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ. Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị. Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu. Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya. Nʼihi na amaara m na mgbe m lachara, agụ jọgburu onwe ya ga-abata nʼetiti unu nke na-agaghị emere igwe atụrụ ebere. Ụfọdụ nʼime unu ga-ebili tụgharịa eziokwu ahụ ịhụ ka ha si otu a dọrọ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ nye onwe ha. Ya mere, na-echenụ nche! Chetakwanụ na nʼime afọ atọ m nọrọ nʼetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri na-adụ unu ọdụ. “Ugbu a ana m etife unu nʼaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nʼaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu ume na inyekwa unu akụnụba ọ kwadobeere ndị ahụ e doro nsọ. Ọ dịghị mgbe ọbụla agụụ ịdọtara onwe m ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ uwe nke onye ọbụla ji gụọ m. Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa niile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so. Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ” Mgbe o kwusiri okwu ndị a, o soro ha niile gbuo ikpere nʼala kpekwa ekpere. Ha bere akwa nke ukwuu, makụọ Pọl, sutukwa ya ọnụ. O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.