ỌLU NDI-OZI 18:1-22
ỌLU NDI-OZI 18:1-22 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint. O we hu otù onye-Ju, aha-ya bu Akwila, onye Pọntọs n'ọmumu-ya, onye siworori n'Itali bia ọhu, ya na nwunye-ya Prisila, n'ihi na Klọdiọs nyereri iwu ka ndi-Ju nile si na Rom pua: o we biakute ha; n'ihi na ya na ha nālu otù ọlu-ǹkà ahu, ya na ha we nọgide, nālu kwa ọlu; n'ihi na ọlu-ǹkà-ha bu ikpa ákwà ulo-ikwū. O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye. Ma mb͕e Sailas na Timọti si na Masedọnia ridata, okwu Chineke nēb͕u Pọl nb͕u n'obi, ọ nāgwasi ndi-Ju ike na Jisus bu Kraist-ha. Ma mb͕e ha nēdo onwe-ha n'usoro imegide ya, nēkwulu kwa ya, o fecha uwe-ya, si ha, Ọbara-unu di n'isi-unu; mu onwem di ọcha: site n'ub͕u a m'gāgakuru ndi mba ọzọ. O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo otù onye, aha-ya bu Taitọs Justọs, onye nāsọpuru Chineke, onye ulo-ya di ulo-nzukọ, ahu ezi nso. Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism. Onye-nwe-ayi we site n'ọhù gwa Pọl okwu n'abali, si, Atula egwu, kama nēkwu, ekpuchi-kwa-la ọnu-gi: n'ihi na Mu onwem nọyere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula gādakwasi gi ime gi ihe ọjọ: n'ihi na enwerem ọtutu madu n'obodo a. O we nọdu n'ebe ahu otù arọ na ọnwa isi, nēzí okwu Chineke n'etiti ha. Ma mb͕e Galio bu onye-isi nke Akaia, ndi-Ju were otù obi guzo imegide Pọl, we kuta ya n'iru oche-ikpé, si, Onye a nārafu madu ka ha sọpuru Chineke n'uzọ megidere iwu-ayi. Ma mb͕e Pọl gaje isaghe ọnu-ya, Galio siri ndi-Ju, Asi na ọ bu okwu nmejọ ma-ọbu ajọ ihe jọb͕uru onwe-ya, unu ndi-Ju, ọ gēkwesi ka m'nagide unu: ma ọ buru na ha bu ajuju bayere okwu-ọnu di iche iche na aha di iche iche na iwu nke aka unu, unu onwe-unu le ha anya; mu onwem ezubeghi ibu onye-ikpé okwu ndia. O we chupu ha n'iru oche-ikpé-ya. Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n'iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n'ihe ndia meturu Galio n'obi. Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa. Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu. Ma mb͕e ha kpere ya ka ọ nọgide oge dikariri anya, o kweghi; ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ. Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk.
ỌLU NDI-OZI 18:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint. Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha, nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu. Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere. Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ. Mgbe ọbụla ha megidere ya ma kparịa ya, ọ na-efecha uwe ya, sị ha, “Ọbara unu dị unu nʼisi, aka m dị ọcha. Malite ugbu a, aga m agakwuru ndị mba ọzọ.” O siri nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Taịtọs Jọstus, onye na-asọpụrụ na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nso nʼụlọ nzukọ ndị Juu. Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim. Onyenwe anyị gwara Pọl nʼọhụ nʼotu abalị sị, “Atụla egwu, kwusie okwu ike, emechikwala ọnụ gị. Nʼihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọbụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a.” Ọ nọgidere ebe ahụ otu afọ na ọkara. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke. Mgbe Galio malitere ịchị achị nʼobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nʼikpeazụ, ha dupụtara ya, gaa nʼụlọikpe. Ha sịrị, “Nwoke a na-amanye ndị mmadụ ka ha na-ekpere Chineke nʼụzọ megidere iwu.” Ma mgbe Pọl chọrọ ikwu okwu, Galio sịrị ndị Juu ahụ, “Agaara m enwe ndidi gee unu ntị ma ọ bụrụ na okwu a gbasara mmejọ mmadụ mejọrọ ibe ya, maọbụ arụ mmadụ mere megide obodo. Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere okwu na aha dị iche iche nakwa iwu unu, gaanụ dozie ya nʼonwe unu. Agaghị m abụ onye ikpe okwu ihe ndị dị otu a.” O sitere nʼime ụlọ ikpe ya chụpụ ha. Ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ahụ tie ya ihe nke ukwuu nʼọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dịka ọ maara ihe na-eme nʼebe ahụ. Mgbe ọ nọsịrị nʼebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, Pọl sịrị ndị kwere ekwe nọ nʼebe ahụ ka ha nọdụnụ nke ọma, ma si nʼebe ahụ banye nʼụgbọ mmiri ruo Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Nʼobodo a na-akpọ Senkria, ọ kpụchara agịrị isi ya, nʼihi nkwa o kwere. Mgbe ha rutere Efesọs, ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ, ma o bu ụzọ banye nʼụlọ nzukọ ebe ya na ndị Juu nwere mkparịta ụka. Ma mgbe ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụkwuoro ha ogologo oge, ọ kweghị. Mgbe ọ na-ahapụ, ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na Chineke kwe, aga m alọghachikwute unu ọzọ.” Emesịa ọ banyere nʼụgbọ hapụ Efesọs. Mgbe ọ kwụsịrị na Sizaria, ọ gara leta chọọchị dị nʼebe ahụ kelee ha. Emesịa, ọ gara nʼihu ruo Antiọk.