ỌLU NDI-OZI 16:25-34
ỌLU NDI-OZI 16:25-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị niile nọ nʼụlọ mkpọrọ ahụ na-ege ha ntị. Na mberede, oke ala ọma jijiji bidoro, nke mere ka ntọala ụlọ mkpọrọ ahụ maa jijiji. Ngwangwa, ọnụ ụzọ ya niile meghere, ụdọ igwe niile e jiri kee ndị mkpọrọ tọpụkwara. Mgbe onyeisi nche ụlọ mkpọrọ tetara nʼụra ma hụ na ọnụ ụzọ niile ghere oghe. Nʼihi ya, o chere na ndị mkpọrọ niile agbapụla. Ya mere, ọ mịpụtara mma agha ya chọọ igbu onwe ya. Ma Pọl tiri mkpu nʼoke olu, sị, “Emerula onwe gị ahụ. Anyị niile nọ nʼebe a!” Onyeisi nche ahụ kpọrọ ka eweta ọkụ, ọ gbabara nʼime, daa nʼụkwụ Pọl na Saịlas na-ama jijiji. Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha sịrị, “Kwere nʼOnyenwe anyị Jisọs, a ga-azọpụta gị na ezinaụlọ gị niile.” Mgbe ahụ, ha gwara ya na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya okwu nke Onyenwe anyị. Nʼotu elekere ahụ, nʼabalị ahụ, ọ sachara ọnya ha. Nʼatụfughị oge, ha mere ya na ezinaụlọ ya baptizim. Ọ kpọbatara ha nʼụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinaụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na o kwerela na Chineke.
ỌLU NDI-OZI 16:25-34 Bible Nso (IGBOB)
Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha; na mberede oké ala-ọma-jijiji di, nke mere ka ntọ-ala ulo-nkpọrọ ma jijiji: ngwa ngwa ọnu-uzọ nile we meghe; ab͕u ndi-nkpọrọ nile tọpu-kwa-ra. Onye-nche ulo-nkpọrọ, ebe emere ka ọ teta n'ura, ebe ọ hu-kwa-ra ọnu-uzọ ulo-nkpọrọ ka ha megheworo, o we miputa mma-agha-ya, gaje ib͕u onwe-ya, ebe ọ nēchè na ndi-nkpọrọ ab͕apuwori. Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a. O we riọ ka eweta ọku, o we mabà nime, da n'iru Pọl na Sailas, ka aru nāma ya jijiji, o we kuputa ha, si, Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m'me ka ewe zọputam? Ha we si, Kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọputa kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi. Ha we gwa ya okwu Onye-nwe-ayi, ya na ndi nile nọ n'ulo-ya. O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile. O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.