ỌLU NDI-OZI 16:11-15
ỌLU NDI-OZI 16:11-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anyị banyere ụgbọ mmiri na Troas sị ya gafee Samotres. Nʼechi ya, anyị bịaruru Niapolis. Site nʼebe ahụ anyị jeruru Filipai nke bụ isi obodo dị nʼakụkụ mpaghara Masidonia bụrụkwa otu akụkụ nʼebe ndị Rom na-achị. Anyị nọdụrụ nʼime obodo a ọtụtụ ụbọchị. Nʼụbọchị izuike, anyị sitere nʼobodo ahụ gaa nʼakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụlọ ekpere dị. Nʼebe a ka anyị nọ gwa ụmụ nwanyị ndị gbakọrọnụ okwu. Aha otu nʼime ndị inyom nụrụ okwu anyị bụ Lidia, onye obodo Tiatira, onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Onyenwe anyị meghere obi ya, ige ntị nʼihe Pọl na-ekwu. Ka e mesịrị ya na ezinaụlọ ya baptizim, ọ rịọrọ anyị na-asị, “Ọ bụrụ nʼezie na unu gụrụ m dịka onye kwesiri ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, batanụ nʼụlọ m nọrọ.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.
ỌLU NDI-OZI 16:11-15 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ayi siri na Troas nupu ub͕ọ, we ga otù iru rue Samọtresi, n'echi-ya ayi we rue Neapọlis; ayi we site n'ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n'obodo ahu ubọchi ufọdu. N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu. Otù nwanyi we nu okwu-ayi, aha-ya bu Lidia, onye nēre ihe eji esiji ákwà ododo, onye obodo Tayataira, onye nātu egwu Chineke: Onye-nwe-ayi we meghe obi-ya, iṅa nti n'ihe nile Pọl nēkwu. Mb͕e emere ya na èzí-na-ulo-ya baptism, ọ riọ ayi, si, Ọ buru na unu atulewo na abum onye kwere n'Onye-nwe-ayi, batanu n'ulom, nọgide n'ebe ahu. O we rugide ayi.