ỌLU NDI-OZI 14:21-28
ỌLU NDI-OZI 14:21-28 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ha zisasiri ozi ọma gwa ndi obodo ahu, me kwa ọtutu madu ka ha buru ndi nēso uzọ Jisus, ha laghachi na Listra, na Aikọniọm, na Antiọk, nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke. Mb͕e ha rọputasiri ndi-okenye nime nzukọ Kraist nile n'otù n'otù nye ha, were kwa ọbubu-ọnu kpe ekpere, ha we rara ha nye n'aka Onye-nwe-ayi, bú Onye ha kwereri na Ya. Ha we gabiga n'etiti Pisidia, bia rue Pamfilia. Mb͕e ha kwusiri okwu Chineke na Paga, ha ridata n'Atalaia; ha we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ je Antiọk, nke esitereri na ya rara ha nye n'amara nke Chineke ilu ọlu nke ha luzuru. Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ. Ha na ndi nēso uzọ Jisus we nọgide ọ bughi nwa oge.
ỌLU NDI-OZI 14:21-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk. Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia. Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru. Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ. Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.