ỌLU NDI-OZI 14:11-15
ỌLU NDI-OZI 14:11-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.” Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu. Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha. Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu, na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.
ỌLU NDI-OZI 14:11-15 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ìgwè madu nile huru ihe Pọl mere, ha welie olu-ha, nāsi n'asusu Laikaọnia, Chi-ayi ridatakuru ayi n'oyiyi madu. Ha we kpọ Banabas, Jupita; kpọ kwa Pọl, Makuri, ebe ya onwe-ya bu onye-isi nēkwu okwu. Onye-nchu-àjà nke Jupita, nke ulo nsọ ya di n'iru obodo ahu, we sekputa ehi weta kwa okoko-osisi n'ọnu-uzọ-ama obodo, ya na ìgwè madu ahu we chọ ichu àjà. Ma mb͕e ndi-ozi ahu, bú Banabas na Pọl, nuru ya, ha dọwa uwe-ha, we pua b͕abà n'etiti ìgwè madu ahu, nēti nkpu, nāsi, Ndikom, gini mere unu nēme ihe ndia? Ayi onwe-ayi bu kwa madu yiri unu n'aru-ayi, ayi nēzì kwa unu ozi ọma, ka unu si n'ihe-efu ndia chigharikute Chineke Nke di ndu, Onye kère elu-igwe na ala na oké osimiri, na ihe nile di ha nime