ỌLU NDI-OZI 13:1-3
ỌLU NDI-OZI 13:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ dị nʼAntiọk. Ụfọdụ nʼime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Manaen (onye azụlitekọrọ ya na eze Herọd), na Sọl. Mgbe ha nọ na-efe Onyenwe anyị ofufe na-ebukwa ọnụ, Mmụọ Nsọ sịrị, “Kewapụtaranụ m Banabas na Sọl, nʼihi ọrụ ahụ nke m kpọrọ ha.” Ya mere, mgbe ha busiri ọnụ kpekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka nʼisi zipụ ha.
ỌLU NDI-OZI 13:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl. Ma mb͕e ha nēfè Onye-nwe-ayi òfùfè, nēbu kwa ọnu, Mọ Nsọ siri, Kewaputaram Banabas na Sọl ilu ọlu nke M'kpọworo ha ka ha lua. Mb͕e ahu, mb͕e ha busiri ọnu kpe kwa ekpere bikwasi kwa ha aka n'isi, ha we zipu ha.