ỌLU NDI-OZI 12:12-19
ỌLU NDI-OZI 12:12-19 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere. Ma mb͕e ọ kuru aka n'ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, otù nwa-ab͕ọghọ, aha-ya bu Roda, biara iṅa nti. Ma mb͕e ọ matara olu Pita, o megheghi ọnu-uzọ-ama n'ihi ọṅù, ma ọ b͕abàra nime ulo, kọrọ ha na Pita guzoro n'iru ọnu-uzọ-ama. Ma ha siri ya, Anya adighi gi nma. Ma o nēkwusi ike na ọ bu otú a. Ha we si, Ọ bu mọ-ozi-ya. Ma Pita nākugide aka n'ọnu-uzọ: mb͕e ha meghesiri, ha hu ya, ibobo we nwua ha n'aru. Ma mb͕e o kpukpusiri ha aka ikpuchi ọnu-ha, ọ kọrọ ha otú Onye-nwe-ayi duputara ya-ri n'ulo-nkpọrọ. Ọ si, Kọrọ Jemes na umu-nna-ayi ihe ndia. O we pua, ga ebe di iche. Ma mb͕e chi bọrọ, ọ bughi nkpasu ntà putara n'etiti ndi-agha, ihe mere Pita. Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu.
ỌLU NDI-OZI 12:12-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ọ ghọtara ihe merenụ, ọ gawara nʼụlọ Meri nne Jọn onye a na-akpọkwa Mak, ebe ọtụtụ mmadụ zukọtararị na-ekpe ekpere. Mgbe ọ kụrụ aka nʼọnụ ụzọ ama, otu odibo nwanyị aha ya bụ Roda bịara ka o zaa ya. Mgbe ọ nụrụ olu Pita, ọṅụ juru ya obi nke mere na ọ gbaara ọsọ laghachi azụ nʼemegheghị ụzọ. Ọ gara tisaa, “Ọ bụ Pita nọ nʼọnụ ụzọ!” Ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dịka onye uche ya na-ezughị oke. Mgbe ọ nọgidesịrị ike na-ekwu otu ihe ahụ, ha sịrị, “Ọ ghaghị ị bụ mmụọ ozi ya.” Ma Pita nọgidere na-akụ aka nʼụzọ. Mgbe ha meghere ụzọ hụ ya, ọ gbagwojuru ha anya. O feere ha aka ka ha mechie ọnụ. Ọ kọọrọ ha otu Onyenwe anyị si dupụta ya site nʼụlọ mkpọrọ. Ọ gwara ha, “Meenụ ka Jemis na ụmụnna anyị niile mata ihe ndị a.” Ọ pụrụ gawa ebe ọzọ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, oke ọgbaaghara dị nʼetiti ndị agha, ebe ha na-eche ihe mere Pita. Mgbe Herọd chọgharịchara ya ma ọ chọtaghị ya, ọ jụrụ ndị nche ahụ ajụjụ dị iche iche. Nʼikpeazụ ọ nyere iwu ka e gbuo ha.