Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 10:9-23

ỌLU NDI-OZI 10:9-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ. Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ihe dịka akwa ọcha dị obosara nke e sitere nʼakụkụ anọ ya na-ewedata nʼala. Ihe dị nʼime ya: bụ ụmụ anụmanụ dị iche iche, ndị nwere ụkwụ anọ, ma anụ ndị na-akpụ akpụ nʼala na ụmụ nnụnụ nke igwe. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu na-asị, “Pita bilie, gbuo ma riekwa.” Ma Pita sịrị, “Mba, Onyenwe m. Ọ dịbeghị mgbe m riri ihe ọbụla rụrụ arụ maọbụ nke na-adịghị ọcha.” Olu ahụ gwara ya nke ugboro abụọ, “Akpọla ihe ọbụla ihe rụrụ arụ bụ nke Chineke mere ka ọ dị ọcha.” Ihe a mere ugboro atọ, ngwangwa, e weghachikwara ya nʼeluigwe. Mgbe Pita nọ na-atule ihe ọhụ ahụ pụtara bụ nke gbakwara ya gharịị, lee, ndị ikom ahụ Kọnelịọs zipụrụ abịarutela kwụsị nʼọnụ ụzọ, na-ajụ ebe ụlọ Saimọn dị. Ha kpọrọ oku ịjụ ma Saimọn onye a na-akpọ Pita ọ nọ nʼụlọ ahụ. Ka Pita nọrịị na-atụgharị uche nʼihe ọhụ ahụ pụtara, Mmụọ Nsọ gwara ya, “Lee, mmadụ atọ guzo nʼọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị. Bilie, rịda jekwuru ha ngwangwa, enwela obi abụọ ị soro ha gawa, nʼihi na ọ bụ m zitere ha.” Pita jekwuru ndị ikom ahụ, sị, “Ọ bụ m bụ onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?” Ha sịrị, “Ọ bụ Kọnelịọs onyeisi agha na-elekọta narị ndị agha zitere anyị. Ọ bụ onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke, bụrụkwa onye ndị Juu niile na-asọpụrụ. Mmụọ ozi dị nsọ gwara ya ka ọ kpọta gị nʼụlọ ya, ịnụ ihe i nwere ikwu.” Ya mere, ọ kpọbatara ha nʼụlọ dịka ndị ọbịa.

ỌLU NDI-OZI 10:9-23 Bible Nso (IGBOB)

Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi: agu we gua ya, o we chọ idetu ihe ọnu: ma mb͕e ha nēdozi ihe, ihe di ka inyoghi biara ya n'anya; o we hu elu-igwe ka emeghere ya-ri, ya na otù ihe ka ọ nārida, dika oké ákwà ọcha, anēsi na nkuku anọ eweda ya n'ala: nke anu ukwu anọ na ihe nākpu akpu nke ala na anu-ufe nke elu-igwe nile di iche iche di nime ya. Otù olu we bia rue ya nti, si, Pita, bilie; b͕ue, ri kwa. Ma Pita siri, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m'riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha. Otù olu we bia rue ya nti ọzọ nke ub͕ò abua, si, Ihe Chineke mere ka ha di ọcha, gi onwe-gi emela ha ihe ruru árú. Ewe me ihe a ub͕ò atọ: ngwa ngwa ewe nara ákwà ahu rigo n'elu-igwe. Ma mb͕e Pita nēnwe obi abua nime onwe-ya ihe ọ gābu, bú ọhù ọ hururi, le, ndikom ahu ndi Kọniliọs zitereri, ebe ha jusiri ajuju ulo Saimon, ha guzoro n'ọnu-uzọ-ama, we kpọ jua ma Saimon, onye anākpọ kwa Pita, nānọ dika ọbìa n'ebe ahu. Ma mb͕e ọhù ahu nādi n'obi Pita, Mọ Nsọ siri ya, Le, ndikom atọ nāchọ gi. Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha. Pita we ridakuru ndikom ahu, si, Le, mu onwem bu onye unu nāchọ: gini bu ihe unu biaworo n'ihi ya? Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta. Ya mere ọ kpọbatara ha, le ha ọbìa. Ma n'echi-ya o bilie so ha pua, ufọdu nime umu-nna nime Kraist, bú ndi Jọpa, so-kwa-ra ya je.