ỌLU NDI-OZI 10:44-48
ỌLU NDI-OZI 10:44-48 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Pita kpu akukọ ndia n'ọnu, Mọ Nsọ dakwasiri ndi nile nuru okwu ahu. Ibobo we nwua ha n'aru, bú ndi kwere na Jisus ndi sitere na ndi obibì-úgwù, ka ha ra, bú ndi soro Pita bia, n'ihi na awusawo-kwa-ra onyinye nke bu Mọ Nsọ n'isi ndi mba ọzọ. N'ihi na ha nānu ka ha nēkwu okwu n'asusu ọzọ di iche iche, nēme kwa ka Chineke di uku. Mb͕e ahu Pita zara, si, Ọ̀ di onye puru inapu miri, ka aghara ime ndia baptism, ndi natara Mọ Nsọ dika ayi onwe-ayi? O we kwue ka eme ha baptism n'aha Jisus Kraist. Mb͕e ahu ha riọrọ ya ka ọ nọgide ubọchi ufọdu.
ỌLU NDI-OZI 10:44-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Pita nọ na-ekwu okwu, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị niile nụrụ okwu a. Nke a juru ndị e biri ugwu nʼetiti ndị kwere ekwe soro Pita bịa anya otu e siri mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ. Nʼihi na ha nụrụ ka ha na-ekwu okwu nʼasụsụ dị iche iche na-etokwa Chineke. Mgbe ahụ Pita jụrụ, “Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.