ỌLU NDI-OZI 10:37-43
ỌLU NDI-OZI 10:37-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Okwu ahụ gbasara nʼala Judịa niile, malite na Galili mgbe Jọn kwusachara baptizim nke ya. Otu Chineke si were Mmụọ Nsọ na ike wụkwasị Jisọs onye Nazaret dịka mmanụ, na otu o si jegharịa na-eme mma na-agwọkwa ndị niile ekwensu na-emekpa ahụ, nʼihi na Chineke nọnyeere ya. “Anyị bụ ndị akaebe ihe niile o mere nʼala ndị Juu na nʼime Jerusalem. Ha gburu ya site nʼịkpọgide ya nʼelu obe. Ma Chineke mere ka o si nʼọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ndị mmadụ hụ ya anya. Ọ bụghị mmadụ niile kama ọ bụ naanị anyị ndị Chineke họpụtara, dịka ndị akaebe, ndị soro ya rie ma ṅụọkwa mgbe o si nʼọnwụ bilie. O nyere anyị iwu ka anyị gaa zisaa oziọma nʼebe niile, ịkọwa na ọ bụ ya ka Chineke họpụtara ịbụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Ndị amụma niile gbara ama ihe banyere ya na onye ọbụla nke kweere na ya ga-enweta mgbaghara mmehie site nʼaha ya.”
ỌLU NDI-OZI 10:37-43 Bible Nso (IGBOB)
akukọ ahu unu onwe-unu matara, nke putara ìhè na Judia dum, nāmalite site na Galili, mb͕e baptism nke Jọn kwusara gasiri; bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya. Ayi onwe-ayi bu kwa ndi-àmà nke ihe nile O mere n'ala ndi-Ju, na nime Jerusalem; Onye ha b͕u-kwa-ra, nākwuba Ya n'elu osisi. Onye ahu ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, O were kwa Ya nye ka egosi Ya n'ìhè. Ọ bughi ndi-Ju nile ka egosiri Ya, kama ọ bu ndi-àmà Chineke buru uzọ rọputa, bú ayi onwe-ayi, ndi soro Ya nēri nāṅu kwa mb͕e O siri na ndi nwuru anwu bilie. O we nye ayi iwu ka ayi kwusara ndi-Ju, ka ayi kwusi kwa ike na Onye a bu Onye Chineke kaworo ibu Onye-ikpé nke ndi di ndu na ndi nwuru anwu. Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.