II. TIMỌTI 3:15-16
II. TIMỌTI 3:15-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs. Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume
Kesaa
Gụọ II. TIMỌTI 3II. TIMỌTI 3:15-16 Bible Nso (IGBOB)
ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus. Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume
Kesaa
Gụọ II. TIMỌTI 3