II. SAMUEL 3:1-5
II. SAMUEL 3:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Agha dị nʼetiti ndị ụlọ Sọl na ụlọ Devid dịịrị ruo oge toro ogologo. Ma ka Devid na-aga nʼihu na-esiwanye ike, ụlọ Sọl na-aga azụ na-ada ada. A mụtaara ọtụtụ ụmụ ndị ikom nye Devid mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn nke, Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit. Nke ise bụ Shefataya nwa Abital; nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid.
II. SAMUEL 3:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Agha ahu we di ogologo n'etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n'iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu. Ewe muara Devid umu-ndikom nime Hebron: ọkpara-ya bu Amnon, nke Ahinoam, bú nwayi Jezreel, muru; nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital; nke-isi bu Itream, nke Egla nwunye Devid muru. Ndia ka amuru Devid nime Hebron.