II. SAMUEL 23:1-7
II. SAMUEL 23:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel. “Mmụọ ONYENWE ANYị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire. Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke. Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’ “Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile. Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta. Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
II. SAMUEL 23:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi a bu okwu ikpe-azu nke Devid. Ihe nke si n'ọnu Devid nwa Jesi puta, Na ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, bú onye emere ka o bilie, Bayere onye nke Chineke Jekob etere manu, Na onye nwere olu di utọ n'ibù abù ọma Israel: Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum, Okwu-Ya di kwa n'irem. Chineke Israel siri, Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu: Onye nāchi madu bu onye ezi omume, Ọ nāchi n'egwu Chineke Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa, Bú ututu igwe-oji nādighi; Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala, Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo. N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute. Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile, N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha: Ma nwoke nke nēmetu ha aka Gēnweju ígwè na osisi ube aka: Agēwere kwa ọku suresia ha n'ọnọdu-ha.