Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 2:8-32

II. SAMUEL 2:8-32 Bible Nso (IGBOB)

Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim; o we me ya eze Gilead, na nke ndi-Ashurait, na nke Jezreel, na nke Efraim, na nke Benjamin, na nke Israel nile. (Ish-boshet nwa Sọl b͕ara ọgu arọ abua mb͕e ọ malitere ibu eze Israel, o we buru eze arọ abua.) Otù ọ di, ulo Juda soro Devid. Ọnu-ọgugu ubọchi Devid bu eze ulo Juda nime Hebron we di arọ asa na ọnwa isi. Abnea nwa Nea, na ndi-orù Ish-boshet nwa Sọl, we si na Mahanaim puta rue Gibeon. Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri. Abnea we si Joab, Biko, ka umu-okorọbia bilie, me ihe-ọchì n'iru ayi. Joab we si, Ka ha bilie. Ha we bilie gabiga n'ọnu-ọgugu; madu iri na abua diri Benjamin, di-kwa-ra Ish-boshet nwa Sọl, na madu iri na abua nime ndi-orù Devid. Ha we jide, nwoke ọ bula o jide isi ibe-ya, we ma mma-agha-ya n'akuku ibe-ya; ha we dakọ n'otù: ewe kpọ aha ebe ahu Helkat-hazurim, nke di na Gibeon. Agha we di ike nke-uku n'ubọchi ahu, ewe tib͕ue Abnea na ndikom Israel n'iru ndi-orù Devid. Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia. Asahel we chua Abnea n'azu; ma o sighi n'iso Abnea wezuga onwe-ya ije n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. Abnea we gha anya n'azu, si, Ọ̀ bu gi bu nka, Asahel? Ọ si, Mu ka ọ bu. Abnea we si ya, Wezuga onwe-gi n'aka-nri-gi ma-ọbu n'aka-ekpe-gi, jidere onwe-gi otù nime umu-okorọbia, chiri n'onwe-gi ihe-ya i gāluta. Ma Asahel ekweghi isi n'iso ya wezuga onwe-ya. Abnea we si kwa Asahel ọzọ, Si n'isom wezuga onwe-gi: nìhi gini ka m'gētib͕u gi rue ala? m'gēsi kwa aṅa weliere Joab nwa-nne-gi irum? Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro. Ma Joab na Abishai churu Abnea n'azu; anyanwu we da mb͕e ndi ahu biaruru ugwu ntà Ama, nke di n'iru Gia n'uzọ ọzara Gibeon. Umu Benjamin we chikọta onwe-ha iso Abnea n'azu, ha we ghọ otù usu, guzo, n'elu otù ugwu ntà. Abnea we kpọ Joab òkù, si, Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka mma-agha gēripia? ì maghi na ilu ka ọ gādi n'ikpe-azu? rù kwa ole mb͕e ka i nāgaghi-asi ndi-gi ka ha si n'iso umu-nne-ha laghachi? Joab we si, Chineke nādi ndu, ọ buru na i kwughi, n'ezie mb͕e ahu site n'ututu ndim gārigowori, nwoke ọ bula site n'iso nwa-nne-ya. Joab we fùa opì-ike, ndi-ya nile we guzo, ha achughi kwa Israel n'azu ọzọ, ha ebughi kwa agha ọzọ. Ma Abnea na ndikom-ya jere ije n'Araba abali ahu nile; ha we gabiga Jọdan, je ije na Bitron nile, bia rue Mahanaim. Joab we si n'iso Abnea lata: ọ we chikọta ndi-ya nile, ma agukọtara ndikom iri na iteghete na Asahel ndi nādighi n'etiti ndi-orù Devid. Ma ndi-orú Devid tib͕uru ọgu ndikom iri-na-asatọ sitere na Benjamin, na n'etiti ndikom Abnea, ha we nwua. Ha we bulie Asahel, lìe ya n'ílì nna-ya, nke di na Bet-lehem. Joab na ndikom-ya we je ije abali ahu nile, ìhè ututu we putara ha na Hebron.

II. SAMUEL 2:8-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim. Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile. Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid. Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii. Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn. Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu. Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.” Joab sịrị, “Ka ha pụta.” Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid. Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha. Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel. Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada. Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ. Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?” Asahel zara sị, “Ọ bụ m.” Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ. Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?” Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ. Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn. Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha. Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?” Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.” Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha. Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim. Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha. Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna. Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.