Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 15:23-37

II. SAMUEL 15:23-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara. Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị. Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya ONYENWE ANYị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.” Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo. Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.” Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ. Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo. Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O ONYENWE ANYị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.” Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.” Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.

II. SAMUEL 15:23-37 Bible Nso (IGBOB)

Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara. Ma, le, Zedok bia-kwa-ra, ya na ndi Livai nile, nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke; ha we dọba ib͕e Chineke, Abaiata we rigo, rue mb͕e ndi ahu nile siri n'obodo gabigasia. Eze we si Zedok Bughachi ib͕e Chineke n'obodo; o buru na ahutam amara n'iru Jehova, Ọ gēweghachim, me ka m'hu ya na ebe-obibi-Ya: ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n'anya-Ya. Eze we si Zedok, bú onye-nchu-àjà, Ọ̀ bughi onye-ọhu-uzọ ka i bu? laghachi n'obodo n'udo, unu na Ahimaaz nwa-gi, na Jonatan nwa Abaiata, bú umu-unu abua. Lenu, mu onwem ganānọgide na ngabiga-miri nke ọzara, rue mb͕e okwu gēsi n'ebe unu nọ bia igosim ka ihe si di. Zedok na Abaiata we bughachi ib͕e Chineke na Jerusalem: ha we nọdu n'ebe ahu. Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá. Otú onye we gosi Devid, si, Ahitofel di n'etiti ndi-nkekọta ahu ndi nēso Absalom. Devid we si, Biko, Jehova, me ka idu-ọdu Ahitofel ghọ ihe-nzuzu. O rue, na mb͕e Devid biaruru elu nrigo ahu, ebe ọ nākpọ isi ala nye Jehova, le, Hushai, bú onye-Akait, biara izute ya, ya na uwe-ya adọwara adọwa, na ájá n'elu isi-ya. Devid we si ya, Ọ buru na i sorom gabiga, i gābu-kwa-ram ibu: ma ọ buru na i laghachi n'obodo, we si Absalom, Orù-gi ka m'bu, eze; dika mu onwem bu orù nna-gi na mb͕e gara aga, ub͕u a mu onwem gābu kwa orù-gi: i gēmebi-kwa-ram idu-ọdu Ahitofel. Gi na ha anọghi kwa n'ebe ahu, bú Zedok na Abaiata ndi-nchu-àjà? o gēru kwa, na okwu ọ bula i gānu site n'ulo eze, i gēgosi ya Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà. Le, ha na umu-ha ndikom abua nọ n'ebe ahu, bú Ahimaaz nwa Zedok, na Jonatan nwa Abaiata; site n'aka-ha ka unu gēzite-kwa-ram okwu ọ bula unu gānu. Hushai, bú eyi Devid, we ba n'obodo; Absalom ba-kwa-ra nime Jerusalem.