II. PITA 3:10-13
II. PITA 3:10-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya. Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
II. PITA 3:10-13 Bible Nso (IGBOB)
Ma ubọchi Onye-nwe-ayi gābia dika onye-ori; nke ọ bu nime ya ka elu-igwe gēji oké ùzù gabiga, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we la n'iyì, uwa na ọlu nile aluru nime ya gērechapu kwa. Ebe anēme ka ihe ndia nile la n'iyì otú a, ọ̀ bu aha madu gini ka unu nāghaghi ibu n'ibi-obi nsọ nile na nsọpuru-Chineke nile, nēle anya ọbibia nke ubọchi ahu nke Chineke, nēme kwa ka ọ bia ngwa ngwa, nke elu-igwe gēre ọku we la n'iyì n'ihi ya, ihe nile di n'elu-igwe gāb͕a kwa ọku we b͕aze? Ma dika nkwa-Ya si di, ayi nēle anya elu-igwe ọhu na uwa ọhu, nke ezi omume bi nime ha.