Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 17:6-41

II. NDI-EZE 17:6-41 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia. Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide ONYENWE ANYị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ ONYENWE ANYị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara. Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile ONYENWE ANYị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla. Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo. Ha chụrụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ọbụla dịka mba ndị naara ebi nʼala ahụ si eme, bụ ndị ONYENWE ANYị chụpụrụ site nʼala ha, mgbe Izrel bịara biri nʼebe ahụ. Ha mere ihe ọjọọ dị iche iche, nke mere ka iwe wee ONYENWE ANYị nke ukwuu. E, ha fere arụsị dị iche iche ofufe, lefuo anya na ONYENWE ANYị dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Unu emela ihe dị otu a.” Mgbe niile ka ONYENWE ANYị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.” Ma ndị Izrel jụrụ ige ntị. Kama ha kpachara anya kwesie olu ha ike dịka nna nna ha mere, bụ ndị na-ekwenyeghị na ONYENWE ANYị Chineke ha. Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na ONYENWE ANYị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.” Ha jụrụ idebe iwu niile ONYENWE ANYị Chineke ha nyere ha. Ha meere onwe ha ogidi arụsị Ashera, kpụọrọ onwe ha oyiyi ụmụ ehi abụọ. Ha kpọrọ isiala nye Baal, na anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando. Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị, si otu a kpasuo ya iwe. Ya mere, ONYENWE ANYị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda. Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile ONYENWE ANYị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha. Mgbe ONYENWE ANYị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso ONYENWE ANYị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu. Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta, tutu ruo mgbe ONYENWE ANYị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa. Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile. Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu ONYENWE ANYị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, ONYENWE ANYị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha. Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.” Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.” Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu ONYENWE ANYị. Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu. Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima. Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim. Ha tụrụ egwu ONYENWE ANYị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu. Ha na-atụ egwu ONYENWE ANYị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị. Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu ONYENWE ANYị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke ONYENWE ANYị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel. Mgbe ONYENWE ANYị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha. Ma ONYENWE ANYị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja. Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ. Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu. Kama, tụọnụ egwu ma fee ONYENWE ANYị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.” Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe. Ọ bụ ezie na ndị a na-efe ONYENWE ANYị ofufe, ma ha nọgidekwara na-ejere arụsị niile ha ozi. Ruo taa, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ ha, gara nʼihu na-emekwa ihe nna nna ha mere.

II. NDI-EZE 17:6-41 Bible Nso (IGBOB)

N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia. O rue, n'ihi na umu Israel mehiere megide Jehova, bú Chineke-ha, Onye nēme ka ha si n'ala Ijipt, si n'okpuru aka Fero, bú eze Ijipt, rigoputa, n'ihi na ha tu-kwa-ra egwu chi di iche iche ọzọ, we jeghari n'ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel, na n'ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere. Umu Israel we were nzuzo me ihe nke nēzighi ezi megide Jehova, bú Chineke-ha, ha we wuere onwe-ha ebe di elu n'obodo-ha nile, site n'ulo-elu ndi nēche nche rue obodo ewusiri ike. Ha guzo-kwa-ra ogidi na Asherim nye onwe-ha n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula: ha we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe ahu n'ebe nile di elu, dika mba ọzọ mere, bú ndi Jehova mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'iru ha; ha me-kwa-ra ihe ọjọ di iche iche ikpasu Jehova iwe: ha we fè arusi di iche iche òfùfè, nke Jehova siri ha, Unu emela ihe a. Jehova we b͕ara Israel àmà, b͕a-kwa-ra Juda, site n'aka onye-amuma ọ bula, na onye-ọhu-uzọ ọ bula, si, Sinu n'uzọ ọjọ nile unu laghachi, debe ihe nile M'nyere n'iwu, na ukpurum nile, dika iwu ahu nile si di nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu, nke M'zite-kwa-ra unu n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma. Ma ha anughi, kama ha kwesiri olu-ha ike, dika olu ndi bu nna-ha, ndi nēkweghi na Jehova, bú Chineke-ha. Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha. Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè. Ha me-kwa-ra ka umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom gabiga nime ọku, ha nāju kwa ase, nāb͕a afa, re onwe-ha ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe. Jehova we wesa Israel iwe nke-uku, si n'iru Ya wezuga ha: ọ dighi ndi fọduru, nābughi ebo Juda, nání ya. Juda edebeghi kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, kama ha jeghariri n'ukpuru nile nke Israel nke ha mere. Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha. N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku. Umu Israel we jegharia nime nmehie nile nke Jeroboam, nke o mere; ha esighi nime ha wezuga onwe-ha; rue mb͕e Jehova siri n'iru Ya wezuga Israel, dika O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya nile, bú ndi-amuma. Ewe me ka Israel si n'elu ala-ha je biri n'Asiria, rue ta. Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile. O rue, na nmalite obibi-ha n'ebe ahu, na ha atughi egwu Jehova: Jehova we zìe ọdum n'etiti ha, ha we nēb͕u ufọdu nime ha. Ha we gwa eze Asiria okwu, si, Mba ndi i mere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi i mere ka ha biri n'obodo Sameria, ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu: O we zìe ọdum n'etiti ha, ma, le, ha nēme ka ha nwua, n'ihi na ha amaghi ikpé Chineke nke ala ahu. Eze Asiria we nye iwu, si, Me ka otù onye nime ndi-nchu-àjà je n'ebe ahu, bú ndi unu mere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ; ka ha je kwa biri n'ebe ahu, ka o zí kwa ha ikpé Chineke ala ahu: Otù onye nime ndi-nchu-àjà ahu ndi ha mere ka ha si na Sameria je biri n'ala ọzọ we bia biri na Bet-el, we nēzí ha otú ha gātu egwu Jehova. Ha we nēme, mba ọ bula chi nke aka ya, ha we dọba ha n'ulo nke ebe di elu nke ndi Sameria mere, mba ọ bula n'obodo-ha ebe ha onwe-ha nēbi. Ndikom Babilon we me Sukot-benot, ndikom Kut me-kwa-ra Neagal, ndikom Hemat me-kwa-ra Ashima, ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n'ọku, bú chi abua nke Sefavaim. Ha we nātu egwu Jehova, mere onwe-ha ndi-nchu-àjà nke ebe nile di elu sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, ha we nēmere ha ihe n'ulo nke ebe nile di elu. Jehova ka ha nātu egwu, ma chi di iche iche nke aka ha ka ha nēfè, dika ikpé mba nile si di, bú ndi emere ka ha si n'ebe ahu je biri n'ala ọzọ. Rue ta ndi ahu nēme dika ikpé mbu nile si di: ha adighi-atu egwu Jehova, ha adighi-eme kwa dika ukpuru nile ha si di, ma-ọbu dika ikpé-ha si di, ma-ọbu dika iwu si di, ma-ọbu dika ihe enyere n'iwu si di, nke Jehova nyere umu Jekob n'iwu, bú onye Ọ guru aha-ya Israel; Jehova we soro ha b͕a ndu, nye ha iwu, si, Unu atula egwu chi di iche iche ọzọ, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu achu-kwara-la ha àjà: kama Jehova, Onye were ike uku na ogwe-aka esetiri eseti me ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, Ya ka unu gātu egwu, Ya ka unu gākpọ kwa isi ala nye, Ya ka unu gāchu-kwa-ra àjà: ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ: ma ọb͕ub͕a-ndu Mu na unu b͕ara, unu echezọla ya; unu atu-kwa-la egwu chi di iche iche ọzọ: kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile. Ma ha anughi, kama dika ikpé mbu ha si di ka ha onwe-ha nēme. Mba ndia we nātu egwu Jehova, ma ọ bu arusi nile ha apiri api ka ha nēfè; umu-ha kwa, na umu umu-ha, dika ndi bu nna-ha mere, otú a ka ha onwe-ha nēme rue ta.