II. NDI-EZE 17:1-4
II. NDI-EZE 17:1-4 Bible Nso (IGBOB)
N'arọ nke-iri-na-abua nke Ehaz, bú eze Juda, ka Hoshea nwa Ila malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ iteghete. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, nání na o meghi dika ndi-eze Israel ndi buru ya uzọ. Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma. Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ.
II. NDI-EZE 17:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz, bụ eze Juda, ka Hoshea nwa Elaa ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze afọ itoolu. O mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ. Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ. Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ.