Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 15:8-29

II. NDI-EZE 15:8-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii. Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ. Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ. Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. Ya mere, okwu ahụ ONYENWE ANYị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria. Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya. Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị. Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime. Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie. Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel. Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ. Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha? Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria. Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie. Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha. Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya. Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.

II. NDI-EZE 15:8-29 Bible Nso (IGBOB)

N'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Azaraia, bú eze Juda, ka Zekaraia nwa Jeroboam malitere ibu eze Israel nime Sameria ọnwa isi. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova dika nna-ya-hà mere: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. Ma ihe Zekaraia mere nke fọduru, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. Nka bu okwu Jehova, nke Ọ gwara Jihu, si, Umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. O we di otú a. Shalum nwa Jebesh malitere ibu eze n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Uzaia, bú eze Juda; o we buru eze ogologo otù ọnwa nime Sameria. Menahem nwa Gadi we si na Tiaza rigo, biarue Sameria, tib͕ue Shalum nwa Jebesh nime Sameria, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. Ma ihe nile Shalum mere nke fọduru, na nkekọta-ya nke ọ kekọtara madu imegide eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. Mb͕e ahu Menahem tib͕uru Tifsa na ndi nile nọ nime ya, na ókè-ala-ya nile, site na Tiaza: n'ihi na ha emegheghi ya uzọ, n'ihi ya ka o tib͕uru ya; ndinyom-ya nile ndi di ime, ọ b͕awara ha afọ. N'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete nke Azaraia, bú eze Juda, ka Menahem nwa Gadi malitere ibu eze Israel arọ iri nime Sameria. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya ubọchi-ya nile, bú nmehie o jiri me ka Israel mehie. Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya. Menahem we naputa ego ahu n'aka Israel, bú n'aka ndi-dike n'àkù, inye eze Asiria, ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri diri otù nwoke. Eze Asiria we laghachi, o guzoghi kwa n'ebe ahu n'ala ahu. Ma okwu Menahem nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Menahem we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Pekahaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri nke Azaraia, bú eze Juda, ka Pekahaia nwa Menahem malitere ibu eze Israel nime Sameria arọ abua. O wee me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya. Ma okwu Pekahaia nile nke fọduru, na ihe nile o mere, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel. N'arọ nke-ọgu-abua-na-iri-na-abua nke Azaraia, bú eze Juda, ka Peka nwa Remalaia malitere ibu eze Israel nime Sameria orú arọ. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova: o sighi na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe-ya, bú nke o jiri me ka Israel mehie. N'ubọchi Peka, bú eze Israel, ka Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, biara, were Ijon, na Ebel-bet-meaka, na Janoa, na Kedesh, na Hezoa, na Gilead, na Galili, bú ala nile nke Naftali; o we me ka ha je biri n'Asiria.