Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 14:1-14

II. NDI-EZE 14:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya. Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash. Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile. Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe ONYENWE ANYị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.” Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa. Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ. I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.

II. NDI-EZE 14:1-14 Bible Nso (IGBOB)

N'arọ nke-abua nke Joash nwa Joahaz, bú eze Israel, ka Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, malitere ibu eze. Ọ b͕ara orú arọ na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iteghete na Jerusalem: aha nne-ya bu Jehoadin nke Jerusalem. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, nání na o meghi dika Devid nna-ya; dika ihe nile si di nke Joash nna-ya mere, otú a ka o mere. Nání na ewzugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu. O rue, mb͕e ala-eze di ike n'aka-ya, na o tib͕uru ndi-orù-ya ndi tib͕uru eze, bú nna-ya: ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya. Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n'agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta. Mb͕e ahu Amazaia zigara ndi-ozi jekuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jihu, bú eze Israel, si, Bia, ka ayi lerita onwe-ayi anya n'iru. Jehoash, bú eze Israel, we zigara Amazaia, bú eze Juda, ozi, si, Uke nke di na Lebanon zigara osisi cedar nke di na Lebanon ozi, si, Nye nwam nwoke nwa-gi nwayi na nwunye: anu-ọhia nke di na Lebanon we gabiga, zọpia uke ahu. I tib͕uwo Edom n'ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n'ulo-gi; ma n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi? Ma Amazaia anughi. Jehoash, bú eze Israel, we rigo; ya onwe-ya na Amazaia, bú eze Juda, we lerita onwe-ha anya n'iru na Bet-shemesh, nke Juda nwere. Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya. Jehoash, bú eze Israel, we jide Amazaia, bú eze Juda, nwa Jehoash nwa Ehazaia, nime Bet-shemesh, we biarue Jerusalem, tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit. Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Jehova, na n'àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.