II. NDI-EZE 13:20-21
II. NDI-EZE 13:20-21 Bible Nso (IGBOB)
Elaisha we nwua, ha we lìe ya. Ma usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Moab batara n'ala mb͕e arọ ọhu biara. O rue, mb͕e ha nēli otù nwoke, le, ha huru usu ndi nāpunara madu ihe; ha we tubà nwoke ahu n'ílì Elaisha: nwoke ahu we da, metu ọkpukpu Elaisha aru, we di ndu, bilie guzo n'ukwu-ya abua.
II. NDI-EZE 13:20-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla. Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.