Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 5:11-21

II. NDI KỌRINT 5:11-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu. Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi. Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu. Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie. Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.

II. NDI KỌRINT 5:11-21 Bible Nso (IGBOB)

Ya mere ebe ayi matara egwu Onye-nwe-ayi, ayi nēme ka madu kweye, ma emewo ka ayi puta ìhè nye Chineke; anamatukwasi kwa obi na emewo ka ayi puta kwa ìhè nime akọ-na-uche-unu. Ayi adighi-eme ọzọ ka unu mara ayi, kama ayi nēkwu dika ndi nēnye unu oghere inya isi n'ihi ayi, ka unu we nwe ihe iza ndi nānya isi n'ihe anāhu anya, ọ bughi kwa n'obi. N'ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n'ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n'ebe unu nọ. N'ihi na ihu-n'anya Kraist nērugide ayi; ebe ayi nātule nka, na otù Onye nwuru n'ọnọdu madu nile, ya mere madu nile nwuru; Ọ nwu-kwa-ra n'ọnọdu madu nile, ka ndi di ndu we ghara idiri onwe-ha ndu ọzọ, kama ka ha diri Onye ahu ndu, bú Onye nwuru n'ọnọdu ha, eme kwa ka O si n'ọnwu bilie. Ya mere ayi onwe-ayi amataghi onye ọ bula site n'ub͕u a dika anu-aru nāmata: ọbuná asi na ayi amawo Kraist dika anu-aru mara, ma ub͕u a ayi amaghi Ya ọzọ otú a. Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu. Ma ihe nile sitere na Chineke, Onye sitere n'aka Kraist me ka ayi na Ya onwe-ya di n'otù, O we nye ayi ije-ozi nke ime-ka-adi-n'otú ahu; nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu. Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù. Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.