II. NDI KỌRINT 4:1-12
II. NDI KỌRINT 4:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke. Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi. Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs. Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst. Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị. A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba. A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi. Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị. Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ. Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.
II. NDI KỌRINT 4:1-12 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka, ebe ayi nwere ije-ozi a, dika emere ayi ebere, ike agwughi ayi n'obi: kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke. Ma asi kwa na ekpudoworo ozi ọma ayi ihe, ọ bu n'etiti ndi nāla n'iyì ka ekpudoworo ya: ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha. N'ihi na ọ bughi ayi onwe-ayi ka ayi nēkwusa, kama ọ bu Kraist Jisus, na Ọ bu Onye-nwe-ayi, ayi nāsi kwa na ayi onwe-ayi bu ndi-orù-unu n'ihi Jisus. N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist. Ma ayi nwere àkù a n'ite ájá, ka ọkika nke ike ahu we buru nke Chineke, ghara kwa isite n'ayi onwe-ayi; anākpab͕u ayi n'akuku nile, ma adighi-akpab͕ubiga ayi ókè; ayi nwere obi abua, ma ayi adighi-enwebiga obi abua ókè; anēsob͕u ayi, ma adighi-arapu nání ayi; anātuda ayi n'ala, ma adighi-ala ayi n'iyì; ayi nēbughari n'aru-ayi mb͕e nile ob͕ub͕u nke Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'aru-ayi. N'ihi na arara ayi onwe-ayi, bú ndi di ndu, nye n'aka ọnwu mb͕e nile n'ihi Jisus, ka ewe me kwa ka ndu nke Jisus puta ìhè n'anu-aru-ayi nke puru inwu anwu. Ya mere ọnwu nālusi ọlu ike nime ayi, ma ndu nālusi ọlu ike nime unu.